NGỤGHARỊ IDUUAZỊ ỤFỌDỤ NKE CHINEDUM ỌFỌMATA

Student: Chinenyenwa Delight Eboh
Supervisor: Dr Chinedu Chidiebere Ezebube
Co-Supervisor: Dr Ifeoma Roseline Okorji
HOD: Dr Joy Oluchi Uguru
Department of Linguistics
Arts
University of Nigeria, Nsukka, Enugu State

Abstract

ỤMỊ Ọrụ nchọcha a mere ngụgharị iduuazị Anụ gbaa ajọ ọsọ na A chọwa isi ọchụ nke Chinedum Ọfọmata dere. Ebumnuche ya bụ ịchọpụta nghọta nkịtị e nwere gbasara isi agwa ndị nọ n’iduuazị ndị a họọrọ, ọzọ kwa bụ inyocha ụzọ e nwere ike isi gbaghaa nghọta e nwere gbasara isi agwa nọ n’iduuazị ndị a họọrọ nakwa ịmata mpụtara nke a dịka o si metụta obibi ndụ ndị Igbo. Ọrụ nchọcha a mere nke a site n’iji atụtụ Dịkọnstrọkshọn nke Jacques Derrida chepụtara. O ji usoro ‘agụm-ugbo-abụọ’ ma mee ngụgharị ya bụ iduuazị. A chọpụtara na ọtụtụ akparamagwa isi agwa ndị nọ n’iduuazị ndị ahụ sitere na nne na nna ha. A chọpụtakwara na mmadụ ịnọ nkịtị bụ ihe jọgburu onwe ya. Nke a na-eme ka mmadụ na-eche echiche dị iche iche nke nwere ike ime ka mmadụ banye ịkpa agwa ọjọọ. Nke a pụtara ihe na nchọcha a maka na isi agwa abụọ a e lebara anya bụ ndị ngana. Ha achọghị ịrụ ọrụ kama izu nke mmadụ kaara ha mma. A chọpụtakwara na mmadụ inwe afọ ojuju dị mma. Ọ bụ enweghị afọ ojuju kpatara ohi dị iche iche nke Ikpendụ na Chigọzie zuru. Afọ ojuju na-eme ka mmadụ sepụ anya n'ihe abụghị nke ya. Mgbe mmadụ nwere afọ ojuju, ihe abụghị nke ya agaghị amasị ya. Onye nwere afọ ojuju anaghị enwe mmasị n'ihe onye ọzọ. Ọnọdụ dị etu a na-ebelata izu ohi na akparamagwa ndị ọzọ dị aṅaa. Ọ bụrụ na Ọgọnna jiiri ehihie chụwa ewu ojii, ọdachi dakwasịrị ya bụ nke ọ kaara ịgbalahụ. Azụghị nwa nke ọma na-ebute ọtụtụ ọghọm nye nwa ahụ nakwa nne na nna ya oge o topuru.

Full-Text Access Notice

In accordance with the NERD Policy on promoting peer-reviewed publication, public access to the full text of a project, thesis or dissertation is restricted for three years, allowing the author and supervisors sufficient time to pursue peer-reviewed publication. During this period, researchers with legitimate academic or research purposes may request authorisation directly from the author to enable NERD to release the indexed full texts of the work using the form below.

Request authorisation from the author